Poems

Ka Anyị Mee Ya Ọzọ

jide aka m nwayọọ

kpanyesia mkpụsị aka gị na nke m
ka m jirikwa nkem kpuchikwa nke gị nwayọọ
ka ọbara anyị gwakọta
wee kepụta ụdọ 
ka anyị gwuo egwuriegwu ụdọ
ka anyị sịbu eme ya
i jidesi ike, ghara ị rapụ onweanyị aka
 
ka anyị mekwaa ya ọzọ
ka anyị si eme ya mgbe niile
maka sọ m ga emenwụ ntakịrị
anyị abụọ ga emesị ihe ike
 
ka m ghara egwuri sọ m
na mbara ezi egwuri-egwu a 
ekwee m nkwa ị nọnyere gị
anyị nyụkọọ mammịrị ọnụ
ọ gbaa ụfụfụ mme-mme
ka anyị mezịenụ ya ọzọ
otu i si eme ya na atọ m n’ahụ ka ikuku
chai! mmịrị osịso m
 
mkparịta ụka gị, nnabata gị na ntinye gị
nchepute gị, egwuri-egwu gị na echiche gị
i nọrọ nwayọọ, hei! i megherịzịa ahụ
nkuzi gị na nnemi aya gị n’ihe
ọbuzịarụ okwu gị na-amị mkpụrụ
chai! ihe ndịa na adọnye m ite ochị n’ihu
 
ka anyị mekwanu ya ọzọ
otu anyị sị eme ya na-atọgbu m
ị na eme m ka m zuo oke
ị na emejuputa m.